3Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ.
4Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.”
5Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?” Ha zara sị, “Anyị ma ya.”
6Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?” Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.”
7Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.”