13Mgbe ahụ Lịa kwuru sị, “Ọṅụ ejula m obi, nʼihi na ụmụ nwanyị ibe m ga-akpọ m onye ihe na-agara nke ọma.” Lịa kpọrọ nwantakịrị nwoke ahụ Asha.
14Otu ụbọchị, nʼoge a na-aghọ ọka wiiti, Ruben nwa Lịa, gara nʼọhịa hụ ahịhịa a na-akpọ mandreki. Ọ kụtaara nne ya ụfọdụ nʼime ahịhịa a. Mgbe Rechel hụrụ ahịhịa a, ọ rịọrọ Lịa sị ya, “Biko nyetụ m ụfọdụ nʼime mandreki ndị a nwa gị nwoke kụtara.”
15Ma Lịa zara sị ya, “O zubeere gị na ị napụrụ m di m? Ị chọkwara ịnapụ m mandreki ndị a nwa m nwoke wetaara m?” Rechel zara Lịa sị, “Ọ dị mma, ka gị na ya dinaa nʼabalị a ka ọ bụrụ ihe mgbanwo maka mandreki nwa gị nwoke.”
16Ya mere, mgbe Jekọb si nʼọhịa na-alọbata nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, Lịa pụrụ izute ya, sị ya, “Ị ga-abakwute m nʼihi na m ejirila m ahịhịa mandreki nwa m nwoke m zụta gị.” Ha dinara nʼabalị ahụ.
17Chineke nụrụ olu Lịa, ọ tụụrụ ime mụtara Jekọb nwa nwoke nke ise.