Jenesis 30

Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.

Genesis 30:25 (UKJV) And it came to pass, when Rachel had born Joseph, that Jacob said unto Laban, Send me away, that I may go unto mine own place, and to my country.

23Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”

24Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”

25Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.

26Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.”

27Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụrụ na m achọtala amara nʼihu gị biko nọdụ, nʼihi na esi m nʼịgba afa chọpụta na Onyenwe anyị agọziela m nʼihi gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.