Jenesis 30

Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”

Genesis 30:24 (UKJV) And she called his name Joseph; and said, The LORD shall add to me another son.

22Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.

23Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”

24Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”

25Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.

26Kpọnye m ndị nwunye m, ndị m ji nʼihi ha gbara gị odibo, ha na ụmụ m, ka m lakwaa. Ị maara otu m siri gbaara gị odibo. Kpọnye m ha ka m duru ha laghachi ebe m si bịa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.