20Ugbu a Lịa kwuru sị, “Chineke enyela m ezi onyinye dị oke ọnụ. Ugbu a, di m ga-eji nkwanye ugwu leta m nʼihi na amụọrala m ya ụmụ ndị ikom isii.” Ọ kpọrọ aha ya Zebụlọn.
21Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.
22Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.
23Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”
24Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”