21Emesịa, Lịa mụrụ nwa nwanyị, kpọọ ya Daịna.
22Chineke chetara Rechel. Ọ nụrụ olu ya, meghee akpanwa ya.
23Nʼihi ya, Rechel tụụrụ ime mụta nwa nwoke. Ọ sịrị, “Chineke ewepụla nkọcha dịịrị m.”
24Rechel kpọrọ aha ya Josef, dị ka ọ sịrị, “Ka Onyenwe anyị nyekwa m nwa nwoke ọzọ.”
25Mgbe Rechel mụsịrị Josef, Jekọb jekwuru Leban sị ya, “Zilaga m ka m laghachi nʼebe m na ala nke m.