31Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị.
32Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m.
33Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”
34Leban zara sị ya, “Ọ dị mma. Ya dịrị dịka i kwuru.”
35Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha.