29Jekọb zara sị Leban, “Gị onwe gị maara otu m si gbara gị odibo na ihe mere igwe anụ ụlọ gị ndị m lekọtara.
30Nʼihi na ole na ole ka i nwere mgbe m bịara, ma ugbu a, ha abaala ụba nke ukwuu. Onyenwe anyị esitela nʼụkwụ m gọzie gị. Ugbu a, kedụ mgbe m ga-arụkwanụ ọrụ nke mụ onwe m maka ezinaụlọ m?”
31Leban jụrụ Jekọb sị, “Kedụ ihe m ga-enye gị?” Jekọb gwara ya sị, “Enyela m ihe ọbụla, kama o nwere otu ihe m chọrọ ka i mee. Ọ bụrụ na i mee ya, aga m alaghachi ilekọta igwe anụ ụlọ gị.
32Kwere ka m jegharịa nʼetiti igwe anụ ụlọ gị, ka m họpụta site nʼetiti igwe atụrụ gị ndị niile tụrụ agwa agwa, na ụmụ atụrụ niile dị oji, na ewu niile tụrụ agwa agwa. Atụrụ na ewu ndị a niile m ga-ahọpụta ga-abụ ụgwọ ọrụ m.
33Ezi omume m ga-azara nʼọdịnihu, mgbe ọbụla ị bịara nyochaa ụgwọ ọrụ ị kwụrụ m. Ewu ọbụla na-atụghị agwa agwa, maọbụ atụrụ ọbụla na-ejighị oji ị chọpụtara nʼetiti igwe ewu na atụrụ nke m ka a ga-agụ dị ka ihe e zuru nʼohi.”