35Nʼotu ụbọchị ahụ, ọ họpụtachara mkpi niile tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nne ewu niile ndị nwere tụrụ agwa maọbụ ntụpọ na nke ọbụla nwere ajị ọcha nʼahụ ya. Ọ họpụtakwara atụrụ ojii niile, nyefee ha nʼaka ụmụ ya ka ha lekọtaa ha.
36Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ.
37Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè.
38Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri,
39ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ.