36Leban jere ije abalị atọ nke kewapụrụ ha site nʼebe Jekọb nọ. Ma Jekọb nọgidere na-elekọta igwe anụ ụlọ Leban ndị ọzọ.
37Mgbe ahụ Jekọb gara gbute ngalaba osisi pọpla, na osisi alụmọnd, na osisi plenụ, kpechapụ ahụ agbụgbọ osisi ndị a, si otu a mee ka ime ime ngalaba osisi ndị a dị ọcha pụta ìhè.
38Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri,
39ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ.
40Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban.