Jenesis 31

Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.

Genesis 31:34 (UKJV) Now Rachel had taken the images, and put them in the camel's furniture, and sat upon them. And Laban searched all the tent, but found them not.

32Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.

33Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.

34Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.

35Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.

36Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.