33Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel.
34Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
35Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ.
36Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike?
37Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.