42A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.”
43Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ?
44Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.”
45Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
46Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.