44Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.”
45Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi.
46Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri.
47Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya.
48Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed.