20Hụkwanụ na unu gwara ya sị, ‘Ohu gị Jekọb nọ nʼazụ anyị.’ ” Echiche ya bụ, “Aga m eji onyinye ndị a niile m na-ezipụrụ ya mee ka obi ya dajụọ, nke ọ ga-abụ mgbe mụ na ya zutere, ma eleghị anya, ọ ga-anabata m.”
21Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ.
22Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha.
23Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
24Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ.