1Jekọb nʼonwe ya hapụrụ gawa nʼihu nʼije ya. Ndị mmụọ ozi Chineke zutere ya nʼụzọ.
2Mgbe Jekọb hụrụ ha, o kwuru sị, “Ebe a bụ ụlọ ikwu Chineke!” Ọ kpọrọ ebe ahụ, Mahanaim.
3Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.
4O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.
5Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”