Jenesis 32

Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”

Genesis 32:5 (UKJV) And I have oxen, and asses, flocks, and male servants, and female servants: and I have sent to tell my lord, that I may find grace in your sight.

3Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia, nʼobodo Edọm.

4O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a.

5Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”

6Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.”

7Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.