16Ịsọ laghachikwara azụ na Sia nʼotu ụbọchị ahụ.
17Ma Jekọb na ezinaụlọ ya jere Sukọt, ebe o wuuru onwe ya ụlọ obibi, wuokwara anụ ụlọ ya ụlọ obibi ha. Ọ bụ nke a mere e ji kpọọ ebe ahụ Sukọt.
18Mgbe Jekọb si Padan Aram lọghachi, o rutere obodo Shekem nke dị nʼala Kenan nʼudo. O mara ụlọ ikwu ya nʼihu obodo ahụ.
19Ọ zụrụ ala ebe o mara ụlọ ikwu ya nʼaka ụmụ Hamọ, nna Shekem, ọ kwụrụ narị mkpụrụ ọlaọcha maka ala ahụ.
20Nʼebe ahụ, o wuru ebe ịchụ aja, kpọọ aha ya El Elohe Izrel.