25O ruo nʼụbọchị nke atọ, mgbe ọnya ugwu ha na-egbu ha mgbu, ụmụ ndị ikom Jekọb abụọ, Simiọn na Livayị, ụmụnne Daịna, jiri mma agha ha pụkwuru ndị bi nʼobodo ahụ na-atụghị anya na ihe dị otu a ga-eme, gbuo ndị ikom niile nọ nʼobodo ahụ.
26Ha gbukwara Hamọ na Shekem nwa ya nwoke, kpọpụta Daịna site nʼụlọ Shekem, laghachi nʼụlọ ha.
27Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.
28Ha kwakọọrọ ngwongwo niile dị nʼobodo ahụ, kpụrụkwa anụ ụlọ niile, igwe ewu na atụrụ, igwe ehi na igwe ịnyịnya ibu niile, na ihe niile dị nʼime obodo ahụ, na ihe niile dị nʼubi ndị ahụ obodo nwere.
29Akụ ha niile, na ndị inyom ha niile na ụmụntakịrị ha, na ihe niile dị nʼime ụlọ ha, ka ha weere dịka ihe a dọtara nʼagha.