1Ugbu a, Daịna nwa nwanyị Lịa mụụrụ Jekọb pụrụ ileta ndị inyom ala ahụ.
2Mgbe Shekem, nwa Hamọ onye Hiv, onye na-achị mpaghara ahụ, hụrụ ya, ọ kpọọrọ ya jiri ike ya na ya dinaa.
3Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
4Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
5Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.