3Mkpụrụobi ya gara nʼebe Daịna nwa Jekọb, ọ hụrụ nwantakịrị nwanyị ahụ nʼanya, gwakwa ya okwu dị nro.
4Shekem sịrị nna ya bụ Hamọ “Lụtara m nwaagbọghọ a, ka ọ bụrụ nwunye m.”
5Mgbe Jekọb nụrụ na e merụrụ Daịna nwa ya nwanyị, nʼihi na ụmụ ya ndị ikom nọ nʼọhịa ebe ha na-azụ anụ ụlọ, ọ gbara nkịtị na-emeghị ihe ọbụla ruo mgbe ha lọtara.
6Hamọ bụ nna Shekem, pụkwuuru Jekọb ka ha kparịta ụka.
7Ụmụ ndị ikom Jekọb si nʼọhịa na-alọta mgbe ha nụrụ ihe merenụ, iwe na ọnụma juputara ha obi nke ukwuu nʼihi na Shekem mere ihe na-eweta ihere nʼIzrel site nʼidinakwuru ada Jekọb, ihe a na-ekwesighị ime eme.