6Jekọb na ndị niile so ya rutere Luz, nke a na-akpọkwa Betel nke dị na Kenan.
7Jekọb wuru ebe ịchụ aja nʼebe a, kpọọ aha ebe ahụ El Betel, nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka Chineke gosiri ya onwe ya mgbe ọ na-agbanarị Ịsọ nwanne ya nwoke.
8Mgbe nke a gasịrị, Debọra, nwanyị lekọtara Ribeka mgbe ọ bụ nwantakịrị, nwụrụ. E liri ya nʼokpuru osisi ook dị na Betel. A kpọkwara ebe ahụ, “Osisi ook ebe ịkwa akwa.”
9Chineke gosiri Jekọb onwe ya ọzọ, mgbe o sitere na Padan Aram pụta, gọziekwa ya.
10Chineke sịrị ya, “Aha gị bụ Jekọb ma a gaghị akpọkwa gị Jekọb ọzọ, kama aha gị ga-abụ Izrel.” Ya mere ọ kpọrọ ya Izrel.