16Ọnụmara Kora, ọnụmara Gatam na ọnụmara Amalek. Ndị eze ndị a bụ ụmụ Elifaz nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ ụmụ Ada.
17Ndị bụ ụmụ Reuel, nwa Ịsọ, e nwere ọnụmara Nahat, ọnụmara Zera, ọnụmara Shama, ọnụmara Miza. Ọnụmara ndị a bụ ụmụ Reuel nʼala Edọm. Ha bụ ụmụ Basemat, nwunye Ịsọ.
18Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
19Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
20Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,