18Ndị a bụ ụmụ Oholibama, nwunye Ịsọ, ọnụmara Jeush, ọnụmara Jalam, na ọnụmara Kora. Ndị a bụ ọnụmara ụmụ Oholibama nwa Ana, nwunye Ịsọ.
19Ndị a niile bụ ụmụ ndị ikom Ịsọ (ya bụ, Edọm). Ndị a bụkwa ọnụmara ha.
20Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Sia onye Hor, ndị bi nʼakụkụ ala ahụ: Lotan, Shobal, Zibiọn, Ana,
21Dishọn, Eza na Dishan. Ụmụ ndị ikom Sia nʼala Edọm, ha bụ ndị ọnụmara Hor.
22Ụmụ ndị ikom Lotan bụ, Hori na Homam. Timna bụkwa nwanne nwanyị Lotan.