7Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.
8Ya mere, Ịsọ gara biri nʼala ugwu ugwu Sia, Ịsọ bụkwa Edọm.
9Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, nna obodo Edọm, nʼala ugwu ugwu Sia.
10Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ịsọ mụtara. Elifaz bụ ọkpara Ada, nwunye Ịsọ. Nwanne ya bụ Reuel, nwa Basemat, nwunye Ịsọ.
11Ụmụ Elifaz ndị ikom bụ, Teman, Ọmaa, Zefo, Gatam na Kenaz.