12Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem.
13Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
14Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya. Ọ bịaruru Shekem,
15ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
16Ọ sịrị, “Ana m achọ ụmụnne m. Biko, ị nwere ike ịgwa m ebe ha nọ na-azụ igwe anụ ụlọ ha?”