23Ya mere, mgbe Josef bịakwutere ụmụnne ya, ha yipụrụ ya uwe mwụda ya, uwe mwụda nwere ọtụtụ agwa o yi nʼahụ.
24Ha duru ya tụnye ya nʼime olulu. Ọ bụ olulu tọgbọrọ nʼefu, nke mmiri na-adịghị nʼime ya.
25Mgbe ha nọdụrụ ala bido iri nri, ha leliri anya ha hụ igwe ndị ahịa Ishmel si Gilead. Ịnyịnya kamel ha bu ụda na mgbaa na máá. Ọ bụkwa Ijipt ka ha bu ihe ndị a na-aga.
26Mgbe ahụ, Juda jụrụ ụmụnne ya, “Uru gịnị ka ọ ga-abara anyị igbu nwanne anyị, ma kpuchie ọbara ya?
27Bịanụ, ka anyị resi ya ndị Ishmel ndị a, ka aka anyị ghara nʼimetụ ya, nʼihi na nwanne anyị na otu anụ ahụ anyị ka ọ bụ.” Ụmụnne ya gere ya ntị.