Jenesis 37

Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.

Genesis 37:31 (UKJV) And they took Joseph's coat, and killed a kid of the goats, and dipped the coat in the blood;

29Ruben mechara lọghachi gaa nʼolulu ahụ, ma ka ọ na-ahụghị Josef nʼime olulu a, ọ dọwara uwe ya.

30O jekwuru ụmụnne ya sị ha, “Nwata ahụ anọkwaghị ebe ahụ! Mụ onwe m, olee ebe m ga-ala?”

31Ụmụnne ya gburu otu ewu were uwe Josef bịanye nʼime ọbara ya.

32Ha chịịrị uwe mwụda ahụ nwere ọtụtụ agwa jekwuru nna ha sị ya, “Anyị hụrụ uwe a nʼime ọhịa. Leruo ya anya ka ị mara maọbụ uwe mwụda nwa gị.”

33Ọ matara na ọ bụ ya, sị, “E, nke a bụ uwe nwa m nwoke. Ajọ anụ eriela ya. Anụ ọhịa adọkasịala Josef nʼezie.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.