16Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” Tama jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?”
17Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?”
18Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
19Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
20Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.