18Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime.
19Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya.
20Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.
21Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.”
22Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”