2Onyenwe anyị nọnyeere Josef, nke mere na ihe gaara ya nke ọma nʼụlọ nna ya ukwu onye Ijipt.
3Nna ya ukwu hụrụ na Onyenwe anyị nọnyeere Josef, hụkwa na Onyenwe anyị na-eme ka ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
4Josef hụtara amara nʼihu ya, ghọọ onyeozi nke aka ya. Pọtifa mere ya onye na-elekọta ezinaụlọ ya. Nyefee ya ihe niile o nwere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ha.
5Site nʼoge a, o mere ka ọ bụrụ onye na-elekọta ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere, Onyenwe anyị gọziri ezinaụlọ onye Ijipt ahụ nʼihi Josef. Ngọzị Onyenwe anyị dịkwasịrị nʼihe niile Pọtifa nwere, ma ihe o nwere nʼụlọ ma ndị o nwere nʼubi ya.
6Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri. Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya.