Jenesis 4

Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.

Genesis 4:19 (UKJV) And Lamech took unto him two wives: the name of the one was Adah, and the name of the other Zillah.

17Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke.

18Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.

19Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.

20Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.

21Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.