19Lamek lụrụ ụmụ nwanyị abụọ. Aha nwunye ya nke mbụ bụ Ada. Aha nke ọzọ bụ Zila.
20Ada mụtara Jabal, onye bụ nna ndị na-azụ anụ ụlọ, na ndị na-ebi nʼụlọ ikwu.
21Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi.
22Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama.
23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.