Jenesis 41

Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.

Genesis 41:42 (UKJV) And Pharaoh took off his ring from his hand, and put it upon Joseph's hand, and arrayed him in vestures of fine linen, and put a gold chain about his neck;

40Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”

41Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.”

42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.

43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.

44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.