43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.
44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
46Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt.
47Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu.