44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania. Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On, ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
46Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt.
47Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu.
48Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu.