4Mgbe ahụ, ehi ndị a bụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ bịara richapụ ehi ndị ahụ buru ibu. Mgbe nke a mere Fero kwolitere.
5Emesịa, Fero rahụkwara ụra ọzọ, rọọ nrọ nke ugboro abụọ, hụ ogbe ọka asaa ndị mịrị nʼotu ukwu ọka. Ogbe ọka ndị a buru ibu maa ezi mma.
6Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
7Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ.
8Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.