6Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
7Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ.
8Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.
9Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m.
10Oge ahụ Fero were iwe megide ndị na-ejere ya ozi, o tinyere mụ na onyeisi ndị na-esi nri nʼụlọ mkpọrọ nke dị nʼebe onyeisi ndị nche eze bi.