26Mgbe Josef lọtara ụlọ, ha wetaara ya onyinye dị nʼaka ha, daa nʼala, kpọọ isiala nye ya.
27Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”
28Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.
29Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.”
30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.