27Josef jụrụ ha ajụjụ banyere ọdịmma ha, jụọkwa ha sị, “Agadi nna unu, nke unu gwara m ihe banyere ya, ahụ ọ dịkwa ya? Ọ ka dịkwa ndụ.”
28Ha zaghachiri sị ya, “Ahụ dị ohu gị bụ nna anyị. Ọ ka nọ ndụ.” Ha hulatara isi ha, kpọọ isiala nye ya.
29Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.”
30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
31Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ.