29Mgbe Josef welitere anya ya elu hụ nwanne ya Benjamin, onye bụ nwanne afọ ya, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye a ọ bụ nwanne unu nke nta ahụ unu gwara m ihe banyere ya?” Tupu ha asaa ya ihe ọbụla, o lere Benjamin anya sị ya, “Ka amara Chineke dịrị gị, nwa m nwoke.”
30Mgbe ahụ kwa Josef mere ọsịịsọ pụọ nʼezi ịchọ ebe ọ ga-akwa akwa nʼihi na ọhụhụ ọ hụrụ nwanne ya anya ọzọ metụrụ ya nnọọ nʼobi. Ọ pụrụ banye nʼime ụlọ ya kwaa akwa.
31Emesịa, ọ sara ihu ya, pụta, jisie onwe ya ike nye odibo ya iwu ka o bute nri ahụ.
32Ha doziiri ya nri nke ya iche, doziekwara ụmụnne ya nri nke ha iche. Otu a kwa, ha dozikwaara ndị Ijipt ya na ha na-erikọ nri, nri nke ha iche. Nʼihi na ọ bụ ihe arụ nʼanya ndị Ijipt na ha na ndị Hibru ga-erikọta nri ọnụ.
33Ma mgbe e nyere ha ọnọdụ nʼihu Josef, e mere ka ha nọdụ dịka ha si tọọ ibe ha. Nke ọkpara buru ụzọ nọdụ, onye na-eso ya anọdụkwa. Otu a ka ha niile siri nọdụ ruo nʼonye ikpeazụ nʼime ha. Ha lerịtara onwe ha anya nʼihi na o juru ha anya.