7Ma ha zara sị ya, “Nna anyị ukwu, gịnị mere i ji ekwu ụdị okwu ndị a? Ihe arụ ka ọ bụ anyị ime ihe dị otu a.
8Lee, ego anyị chọtara nʼọnụ akpa anyị ka anyị sitere nʼala Kenan weghachi. Olee otu anyị ga-esi zuru ọlaedo maọbụ ọlaọcha site nʼụlọ nna gị ukwu?
9Onye ọbụla nʼime anyị a chọtara iko a nʼaka ya ga-anwụ. Anyị onwe anyị ga-aghọrọ nna anyị ukwu ndị ohu.”
10Odibo ahụ zara sị ha, “Ka ọ dịrị dịka unu kwuru. Onye ọbụla a chọtara ya nʼaka ga-abụ ohu m. Ma ndị a na-achọtaghị ya nʼaka ha enweghị ịta ụta ọbụla.”
11Ha mere ngwangwa, onye ọbụla tọdatara akpa ya. Onye ọbụla kwa meghere akpa ya.