11Nʼebe ahụ ka m ga-enyekwa gị ihe ị chọrọ, nʼihi na ụnwụ afọ ise ka dị nʼihu na-abịa. Ọ bụrụ na i meghị otu a, gị na ezinaụlọ gị na ihe niile bụ nke gị ga-ada ụkpa.’
12“Nʼezie, anya unu na nʼanya nwanne m Benjamin, ahụla na mụ onwe m ji ọnụ m na-agwa unu okwu ndị a.
13Unu ga-akọrọ nna m maka nsọpụrụ niile a na-enye m nʼala Ijipt na ihe niile unu hụrụ. Kpọtakwanụ nna m ọsịịsọ ebe a.”
14Ugbu a, ọ dakwasịrị nʼolu Benjamin, nwanne ya, kwaa akwa. Benjamin jidekwara ya nʼolu kwaa akwa.
15Emesịa, o suturu ụmụnne ya niile ọnụ, bekwasịkwa ha akwa. Nʼikpeazụ, ụmụnne ya kpanyeere ya ụka.