16Mgbe akụkọ a ruru ụlọ Fero na ụmụnne Josef bịara, ọ tọrọ Fero na ndịisi ozi niile ya ụtọ.
17Fero gwara Josef sị ya, “Gwa ụmụnne gị, ka ha mee ihe otu a, ha bokwasị ịnyịnya ibu unu ibu laghachikwa nʼala Kenan.
18Ha ruo, ha kpọta nna gị, na ezinaụlọ ha, ka ha lọghachikwute m nʼala Ijipt. Nʼihi na aga m enye ha ala kachasị mma nʼIjipt. Ha onwe ha ga-erikwa uru ala ahụ.
19“Gwakwa ụmụnne gị okwu sị ha, ‘Sitenụ nʼala Ijipt were ụgbọala, nke unu ga-eji budata ndị nwunye unu na ụmụntakịrị unu. Dutekwanụ nna unu.
20Unu esogbula onwe unu banyere ngwa ụlọ unu, nʼihi na ihe niile dị mma nʼala Ijipt bụ nke unu.’ ”