1Nʼoge a, Josef enwekwaghị ike ijite onwe ya aka nʼihu ndị na-ejere ya ozi. O welitara olu sị, “Zipụnụ onye ọbụla site nʼebe m nọ.” Ya mere, o nweghị onye ya na Josef nọ mgbe ọ kọọrọ ụmụnne ya onye ọ bụ.
2O tiri mkpu akwa nke ndị Ijipt nụrụ, na nke ndị ụlọ Fero nụkwara.
3Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.
4Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.
5Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.