3Josef gwara ụmụnne ya sị, “Mụ onwe m bụ Josef. Nna m ọ ka nọ ndụ ugbu a?” Ma ụmụnne ya enweghị ọnụ ha ji asa ya, nʼihi na oke egwu jidere ha nʼihu ya.
4Mgbe ahụ, Josef sịrị ụmụnne ya, “Biko, bịanụ m nso.” Mgbe ha bịara ya nso, ọ sịrị ha, “Abụ m nwanne unu, Josef, onye unu rere ree gaa Ijipt.
5Ma otu ọ dị, ka ọ ghara iwute unu, unu atakwala onwe unu ụta nʼihi orure unu rere m. Nʼihi na ọ bụ nʼihi ichebe ndụ unu ka Chineke ji buru ụzọ zite m nʼebe a.
6Oge ụnwụ agwụchabeghị. Ọ bụ ezie na afọ abụọ nke oke ụnwụ agafeela, ma ọ fọdụrụ afọ ise ọzọ nʼihu, oge a na-agaghị akọ ihe ọbụla nʼala, maọbụ iwere ihe ọbụla nʼubi.
7Chineke zitere m ka m buru ụzọ bịa nʼebe a nʼihi ime ka ndụ fọdụrụ unu nʼụwa, na ịzọpụta ndụ unu site nʼụzọ nnapụta dị oke egwu.