13Josef kpọọrọ ha abụọ, Ifrem nʼaka nri ya nke bụ aka ekpe Izrel, na Manase nʼaka ekpe ya nke bụ aka nri Izrel, kpọta ha bịa nna ya nso.
14Ma Izrel setịrị aka nri bikwasị ya nʼisi Ifrem, nwa nke nta. Ma aka ekpe ya ka o setịpụrụ bikwasị nʼisi Manase bụ ọkpara.
15Mgbe ahụ, ọ gọziri Josef sị ya. “Ka Chineke, onye nna m ha Ebraham na Aịzik jere ije nʼihu ya Chineke onye bụrịị Onye zụrụ m dịka atụrụ ogologo ndụ m niile ruo taa,
16Mmụọ ozi ahụ napụtara m site nʼihe egwu niile, ya gọzie ụmụ ndị ikom ndị a. Ka ha bụrụ ndị a kpọkwasịrị aha m na aha nna m ha Ebraham na Aịzik, ka ha mụbaa hie nne nʼelu ụwa.”
17O wutere Josef mgbe ọ hụrụ na nna ya bikwasịrị aka nri ya nʼisi Ifrem. O jidere aka nna ya iwepụ ya nʼisi Ifrem, ka ọ tụkwasị ya nʼisi Manase.