18“O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
19“Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
20“Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.
21“Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ, nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma.
22“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.