16“Dan ga-eme ka ikpe ziri ezi rute ndị ya aka dịka otu nʼime ebo Izrel.
17Dan ga-adị ka agwọ dị nʼakụkụ okporoụzọ, dịka ajụala dị nʼụzọ ọhịa, nke na-ata ịnyịnya nʼikiri ụkwụ, si otu a mee ka onye na-agba ịnyịnya dalaa azụ.
18“O Onyenwe anyị, ana m ele anya nnapụta gị.
19“Gad bụ onye usuu ndị o-ji-egbe-aga ga-abịakwasị, ma ọ ga-alụso ha ọgụ, chụọkwa ha ọsọ.
20“Asha ga-esi nʼubi ya wepụta nri gbara abụba, nke na-adị ndị eze mma.