22“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi, na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị.
23Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
24Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel,
25nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
26Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.